Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,
“ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ
ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’
bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.”