Mba niile were oke iwe megide gị,
ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ.
Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe
na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha,
na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị,
bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu.
Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”