1
Abụ Ọma 46:10
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
Compare
Explore Abụ Ọma 46:10
2
Abụ Ọma 46:1-2
Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
Explore Abụ Ọma 46:1-2
3
Abụ Ọma 46:4-5
Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
Explore Abụ Ọma 46:4-5
4
Abụ Ọma 46:9
Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.
Explore Abụ Ọma 46:9
Home
Bible
Plans
Videos