1
Abụ Ọma 37:4
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ka ihe ONYENWE ANYị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Compare
Explore Abụ Ọma 37:4
2
Abụ Ọma 37:5
Nyefee onwe gị nʼaka ONYENWE ANYị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a
Explore Abụ Ọma 37:5
3
Abụ Ọma 37:7
Dere duu nʼihu ONYENWE ANYị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Explore Abụ Ọma 37:7
4
Abụ Ọma 37:3
Tụkwasị ONYENWE ANYị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
Explore Abụ Ọma 37:3
5
Abụ Ọma 37:23-24
Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya.
Explore Abụ Ọma 37:23-24
6
Abụ Ọma 37:6
Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
Explore Abụ Ọma 37:6
7
Abụ Ọma 37:8
Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
Explore Abụ Ọma 37:8
8
Abụ Ọma 37:25
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Explore Abụ Ọma 37:25
9
Abụ Ọma 37:1
Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo
Explore Abụ Ọma 37:1
Home
Bible
Plans
Videos