1
Ndị Filipai 1:6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
Compare
Explore Ndị Filipai 1:6
2
Ndị Filipai 1:9-10
Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.
Explore Ndị Filipai 1:9-10
3
Ndị Filipai 1:21
Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.
Explore Ndị Filipai 1:21
4
Ndị Filipai 1:3
Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
Explore Ndị Filipai 1:3
5
Ndị Filipai 1:27
Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma
Explore Ndị Filipai 1:27
6
Ndị Filipai 1:20
Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.
Explore Ndị Filipai 1:20
7
Ndị Filipai 1:29
Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
Explore Ndị Filipai 1:29
Home
Bible
Plans
Videos