Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?”
Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.”
Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.”
Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.”
Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.”
Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m.