Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, Jerusalem.
Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị.
Unu ndị na-akpọku ONYENWE ANYị,
unu enyela onwe unu izuike.
Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka Jerusalem guzosie ike,
meekwa ya otuto nke ụwa niile.