1
Ndị Hibru 8:12
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Compare
Explore Ndị Hibru 8:12
2
Ndị Hibru 8:10
Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
Explore Ndị Hibru 8:10
3
Ndị Hibru 8:11
Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
Explore Ndị Hibru 8:11
4
Ndị Hibru 8:8
Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, “Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.
Explore Ndị Hibru 8:8
5
Ndị Hibru 8:1
Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.
Explore Ndị Hibru 8:1
Home
Bible
Plans
Videos