1
Diuteronomi 28:1
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile ONYENWE ANYị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, ONYENWE ANYị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu.
Compare
Explore Diuteronomi 28:1
2
Diuteronomi 28:2
Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere ONYENWE ANYị Chineke gị isi.
Explore Diuteronomi 28:2
3
Diuteronomi 28:13
ONYENWE ANYị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
Explore Diuteronomi 28:13
4
Diuteronomi 28:12
ONYENWE ANYị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.
Explore Diuteronomi 28:12
5
Diuteronomi 28:7
ONYENWE ANYị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
Explore Diuteronomi 28:7
6
Diuteronomi 28:8
ONYENWE ANYị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. ONYENWE ANYị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
Explore Diuteronomi 28:8
7
Diuteronomi 28:6
Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ.
Explore Diuteronomi 28:6
8
Diuteronomi 28:3
Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi.
Explore Diuteronomi 28:3
9
Diuteronomi 28:4
Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.
Explore Diuteronomi 28:4
10
Diuteronomi 28:9
ONYENWE ANYị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu ONYENWE ANYị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.
Explore Diuteronomi 28:9
11
Diuteronomi 28:5
Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
Explore Diuteronomi 28:5
12
Diuteronomi 28:11
ONYENWE ANYị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
Explore Diuteronomi 28:11
13
Diuteronomi 28:10
Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha ONYENWE ANYị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.
Explore Diuteronomi 28:10
14
Diuteronomi 28:14
Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
Explore Diuteronomi 28:14
15
Diuteronomi 28:15
Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere ONYENWE ANYị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
Explore Diuteronomi 28:15
Home
Bible
Plans
Videos