Otu a ka ONYENWE ANYị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu ONYENWE ANYị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.