1
Ọrụ Ndị Ozi 20:35
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”
Compare
Explore Ọrụ Ndị Ozi 20:35
2
Ọrụ Ndị Ozi 20:24
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 20:24
3
Ọrụ Ndị Ozi 20:28
Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 20:28
4
Ọrụ Ndị Ozi 20:32
“Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ.
Explore Ọrụ Ndị Ozi 20:32
Home
Bible
Plans
Videos